Ọnụọgụgụ 32:25
Numbers 32:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.
Numbers 32:25 in English
Numbers 32:25 · Berean Standard Bible
The Gadites and Reubenites said to Moses, “Your servants will do just as our lord commands.
Context
23“Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu. 24Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.” 25Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu. 26Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead. 27Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.