Native Bible

Numbers 31:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.”

Numbers 31:50 in English

Numbers 31:50 · Berean Standard Bible

So we have brought to the LORD an offering of the gold articles each man acquired—armlets, bracelets, rings, earrings, and necklaces—to make atonement for ourselves before the LORD.”

Context

48Mgbe ahụ, ndịisi agha niile na ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha bịakwutere Mosis, 49sị ya, “Ndị ohu gị agụọla ndị niile gara agha nọ nʼokpuru anyị, chọpụta na o nweghị onye ọbụla a na-achọ achọ. 50Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.” 51Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha. 52Ịdị arọ nke ihe ọlaedo niile nke ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha, nke Mosis na Elieza chere nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye, dị narị kilogram na iri itoolu.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.