Native Bible

Numbers 31:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla.

Numbers 31:28 in English

Numbers 31:28 · Berean Standard Bible

Set aside a tribute for the LORD from what belongs to the soldiers who went into battle: one out of every five hundred, whether persons, cattle, donkeys, or sheep.

Context

26“Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ. 27Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile. 28Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla. 29Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe Onyenwe anyị ketara. 30Otu aka ahụ kwa, site nʼoke ndị Izrel ga-eketa, kee ụtụ. Otu ụzọ nʼime iri ise, maọbụ mmadụ, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, maọbụ igwe anụ ụlọ ụzọ. Were ha nye ndị Livayị, ndị ọ dị nʼaka ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ oke nke ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.