Ọnụọgụgụ 31:14
Numbers 31:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta.
Numbers 31:14 in English
Numbers 31:14 · Berean Standard Bible
But Moses was angry with the officers of the army—the commanders of thousands and commanders of hundreds—who were returning from the battle.
Context
12Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko. 13Mosis na Elieza onye nchụaja na ndị ndu ọgbakọ Izrel niile pụrụ gaa zute ha nʼazụ ebe ha mara ụlọ ikwu ha. 14Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta. 15Mosis jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji debe ndị inyom niile ndị a ndụ? 16Ọ bụ ndị a bụ ndị gbasoro ndụmọdụ Belam, rafuo ndị Izrel mee ka ha ghọọ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị nʼihe gbasara okwu Peoa. Ọ bụ nke a mere ka nrịa nrịa ọjọọ ahụ na-efe efe dakwasị ndị nke Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.