Native Bible

Numbers 31:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ.

Numbers 31:10 in English

Numbers 31:10 · Berean Standard Bible

Then they burned all the cities where the Midianites had lived, as well as all their encampments,

Context

8Nʼime ndị ha gburu nʼagha ahụ bụ ndị eze Midia ise a na-akpọ Evi, Rekem, Zua, Hua na Reba. Ha jikwa mma agha gbuo Belam nwa Beoa. 9Ndị agha Izrel chịkọtara ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile nọ nʼala Midia dịka ndị ha dọtara nʼagha. Ha chịkọtara ngwongwo niile ndị Midia ji biri, tinyere igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ ha niile, dịka ihe ha dọtara nʼagha. 10Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ. 11Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ. 12Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.