Ọnụọgụgụ 30:7
Numbers 30:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
di ya nụ banyere ya ma gba ya nkịtị nʼụbọchị ahụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ ga-eguzogide, ọ ga-emezu ya.
Numbers 30:7 in English
Numbers 30:7 · Berean Standard Bible
and her husband hears of it but says nothing to her on that day, then the vows or pledges by which she has bound herself shall stand.
Context
5Ma ọ bụrụ na nna ya ajụ mgbe ọ nụrụ banyere ya na ọ gaghị emezu nkwa dị otu ahụ, mgbe ahụ, nkwa ahụ maọbụ iyi ọ ṅụrụ ga-abụ ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya, nʼihi na nna ya jụrụ na ọ ga-emezu nkwa ya. 6“Ọ bụrụ na o mesịa lụọ dị, mgbe ọ ṅụsịrị iyi, maọbụ kwee nkwa nzuzu o kwesiri imezu, 7di ya nụ banyere ya ma gba ya nkịtị nʼụbọchị ahụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ ga-eguzogide, ọ ga-emezu ya. 8Ma ọ bụrụ na di ya ajụ ịnabata nkwa ahụ, maọbụ ọṅụṅụ iyi nzuzu ahụ, ọjụjụ di ya jụrụ nkwa ahụ ga-eme ka iyi ahụ maọbụ nkwa ahụ ghara ịdị ire. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya. 9“Ma nkwa ọbụla nke nwanyị di ya nwụrụ maọbụ nwanyị ya na di ya kewara, ihe ọbụla nke o ji ọnụ ya kwuo ka ọ ghaghị imezu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.