Ọnụọgụgụ 30:4
Numbers 30:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọ bụrụ na nna ya anụ mgbe ọ na-ekwe nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ahụ, ma gba ya nkịtị,* onye dị otu a aghaghị imezu nkwa niile ndị ahụ o kwere.
Numbers 30:4 in English
Numbers 30:4 · Berean Standard Bible
and her father hears about her vow or pledge but says nothing to her, then all the vows or pledges by which she has bound herself shall stand.
Context
2Mgbe nwoke ọbụla kwere Onyenwe anyị nkwa, maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla, ọ gaghị emebi nkwa dị otu a. Kama ọ ga-emezu ihe niile dịka o kwuru ya. 3“Ọ bụrụ na nwaagbọghọ nọ nʼụlọ nna ya ekwe Onyenwe anyị nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla, 4ọ bụrụ na nna ya anụ mgbe ọ na-ekwe nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ahụ, ma gba ya nkịtị,* onye dị otu a aghaghị imezu nkwa niile ndị ahụ o kwere. 5Ma ọ bụrụ na nna ya ajụ mgbe ọ nụrụ banyere ya na ọ gaghị emezu nkwa dị otu ahụ, mgbe ahụ, nkwa ahụ maọbụ iyi ọ ṅụrụ ga-abụ ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya, nʼihi na nna ya jụrụ na ọ ga-emezu nkwa ya. 6“Ọ bụrụ na o mesịa lụọ dị, mgbe ọ ṅụsịrị iyi, maọbụ kwee nkwa nzuzu o kwesiri imezu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.