Native Bible

Numbers 30:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na o mesịa jụ na nwunye ya agaghị emezu nkwa ahụ ọ kwere, ikpe ọmụma niile dị nʼihi emezughị nkwa ahụ dị ya nʼisi.”

Numbers 30:15 in English

Numbers 30:15 · Berean Standard Bible

But if he nullifies them after he hears of them, then he will bear her iniquity.”

Context

13Ya mere, di ya nwere ike ịjụ, maọbụ mesie nkwa ahụ, maọbụ iyi ahụ ọ ṅụrụ ike. 14Ọ bụrụ na di ya ekwughị ihe ọbụla site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị ọzọ, mgbe ahụ, o gosiri na o kwenyere ka nwunye ya mezuo nkwa maọbụ iyi ndị ahụ niile. 15Ọ bụrụ na o mesịa jụ na nwunye ya agaghị emezu nkwa ahụ ọ kwere, ikpe ọmụma niile dị nʼihi emezughị nkwa ahụ dị ya nʼisi.” 16Ndị a bụ usoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis banyere mmekọrịta nke nwoke na nwunye ya. Ọ metụtakwara nna na nwa ya nwanyị onye bi nʼụlọ ya. 30:4 Ma o kwughị ihe ọbụla

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.