Ọnụọgụgụ 3:10
Numbers 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Họpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị na-eje ozi dịka ndị nchụaja. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ka a ga-egbu.”
Numbers 3:10 in English
Numbers 3:10 · Berean Standard Bible
So you shall appoint Aaron and his sons to carry out the duties of the priesthood; but any outsider who approaches the tabernacle must be put to death.”
Context
8Ha ga-elekọta ngwongwo ụlọ nzute, rụọ ọrụ metụtara ndị Izrel niile mgbe ha na-eje ozi ha nʼebe obibi ahụ. 9Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam. 10Họpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị na-eje ozi dịka ndị nchụaja. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ka a ga-egbu.” 11Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 12“Anarala m ndị Livayị dịka ndị nọchitere anya ụmụ ndị ikom mbụ niile a mụrụ nʼetiti ndị Izrel. Ndị Livayị niile bụ nke m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.