Native Bible

Numbers 29:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.

Numbers 29:15 in English

Numbers 29:15 · Berean Standard Bible

and a tenth of an ephah with each of the fourteen lambs.

Context

13Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ. 14A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ, 15ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla. 16Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha. 17“ ‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.