Native Bible

Numbers 27:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke.

Numbers 27:10 in English

Numbers 27:10 · Berean Standard Bible

If he has no brothers, give his inheritance to his father’s brothers.

Context

8“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị. 9Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke. 10A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke. 11Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’ ” 12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.