Native Bible

Numbers 25:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Mosis sịrị ndị ọkaikpe Izrel, “Onye ọbụla nʼime unu aghaghị igbu ndị unu, bụ ndị jikọtara onwe ha na Baal nke Peoa.”

Numbers 25:5 in English

Numbers 25:5 · Berean Standard Bible

So Moses told the judges of Israel, “Each of you must kill all of his men who have joined in worshiping Baal of Peor.”

Context

3Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa.* Nke a mere ka iwe Onyenwe anyị nwuru ọkụ megide ha. 4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Duru ndị ndu ebo niile nke Izrel gbuo ha ma kwụnye ha nʼosisi nʼihu Onyenwe anyị nʼetiti ehihie, ka oke iwe Onyenwe anyị dị ọkụ ghara ịbịakwasị ndị Izrel.” 5Ya mere, Mosis sịrị ndị ọkaikpe Izrel, “Onye ọbụla nʼime unu aghaghị igbu ndị unu, bụ ndị jikọtara onwe ha na Baal nke Peoa.” 6Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 7Mgbe Finehaz na Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja hụrụ ihe a, ọ hapụrụ ọgbakọ Izrel. O were ùbe nʼaka ya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.