Ọnụọgụgụ 23:3
Numbers 23:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị.
Numbers 23:3 in English
Numbers 23:3 · Berean Standard Bible
“Stay here by your burnt offering while I am gone,” Balaam said to Balak. “Perhaps the LORD will meet with me. And whatever He reveals to me, I will tell you.” So Balaam went off to a barren height,
Context
1Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.” 2Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu. 3Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị. 4Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.” 5Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.