Ọnụọgụgụ 22:36
Numbers 22:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Balak nụrụ na Belam nọ nʼụzọ na-abịa, ọ pụrụ gaa izute Belam nʼotu obodo Moab nke dị nʼọnụ mmiri Anọn, nke dị na ngwụcha oke ala ya.
Numbers 22:36 in English
Numbers 22:36 · Berean Standard Bible
When Balak heard that Balaam was coming, he went out to meet him at the Moabite city on the Arnon border, at the edge of his territory.
Context
34Nʼoge a, Belam sịrị mmụọ ozi Onyenwe anyị, “Emehiela m. Amaghị m na i guzo nʼụzọ igbochi m. Ọ bụrụ iwe na-ewe gị, ejikeere m ịlaghachi azụ.” 35Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị Belam, “Soro ndị ikom a gaa, ma kwuo naanị ihe m sị gị kwuo.” Ya mere, Belam soro ndị ozi eze Balak gaa. 36Mgbe Balak nụrụ na Belam nọ nʼụzọ na-abịa, ọ pụrụ gaa izute Belam nʼotu obodo Moab nke dị nʼọnụ mmiri Anọn, nke dị na ngwụcha oke ala ya. 37Mgbe ọ bịarutere, Balak jụrụ Belam ajụjụ sị ya, “Eziri m gị ozi ka ị bịa ngwangwa, gịnị mere ị bịaghị? Ọ bụ na m enweghị ike ịsọpụrụ gị?” 38Belam zaghachiri, “Lee, Abịakwutelam gị ugbu a, ma enweghị m ike ikwu ihe ọbụla dị m mma. Ọ bụ naanị ihe Chineke tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.