Ọnụọgụgụ 22:15
Numbers 22:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ.
Numbers 22:15 in English
Numbers 22:15 · Berean Standard Bible
Then Balak sent other princes, more numerous and more distinguished than the first messengers.
Context
13Mgbe chi bọrọ, Belam biliri gwa ndị ozi Balak sị ha, “Laghachinụ nʼobodo unu nʼihi na Onyenwe anyị ekweghị ka m soro unu.” 14Ya mere, ndị ozi Moab laghachikwuru Balak gwa ya sị, “Belam jụrụ iso anyị lọghachi.” 15Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ. 16Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya,
“Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m. 17Nʼihi na aghaghị ịsọpụrụ gị nʼebe ọ dị ukwuu m,* mekwaa ihe ọbụla ị sị m mee. Naanị bịa ka ị bụọrọ m ndị a ọnụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.