Native Bible

Numbers 21:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.* 21:35 Mgbe ndị Izrel meriri eze niile ndị a nʼagha, ha bichiri ala niile dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan. Ha bichiri ala ndị Moab ruo ọ bụladị nʼala ugwu ugwu Bashan, nke dị na mpaghara ugwu Hemon. Ndị Juu na-eme mmemme banyere mmeri a ha meriri eze Saịhọn, na Ọg. Abụ 135:10-11; 136:19-20

Numbers 21:35 in English

Numbers 21:35 · Berean Standard Bible

So they struck down Og, along with his sons and his whole army, until no remnant was left. And they took possession of his land.

Context

33Mgbe ahụ, ha chigharịrị gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụọ izute ha na Edrei. 34Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu, sị, “Atụla ya egwu nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait onyeisi obodo ya bụ Heshbọn.” 35Ya mere, ha gburu ya, tinyere ụmụ ya na ndị agha ya niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ nye ha. Ha nwetakwara ala ha, biri nʼime ya.* 21:35 Mgbe ndị Izrel meriri eze niile ndị a nʼagha, ha bichiri ala niile dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan. Ha bichiri ala ndị Moab ruo ọ bụladị nʼala ugwu ugwu Bashan, nke dị na mpaghara ugwu Hemon. Ndị Juu na-eme mmemme banyere mmeri a ha meriri eze Saịhọn, na Ọg. Abụ 135:10-11; 136:19-20

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.