Native Bible

Numbers 19:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa.

Numbers 19:4 in English

Numbers 19:4 · Berean Standard Bible

Eleazar the priest is to take some of its blood on his finger and sprinkle it seven times toward the front of the Tent of Meeting.

Context

2“Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ Onyenwe anyị nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya. 3Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya. 4Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa. 5Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ. 6Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.