Native Bible

Numbers 18:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel.

Numbers 18:20 in English

Numbers 18:20 · Berean Standard Bible

Then the LORD said to Aaron, “You will have no inheritance in their land, nor will you have any portion among them. I am your portion and your inheritance among the Israelites.

Context

18Ozu anụ ndị a niile e gburu ga-abụ nke gị, dịka obi anụ na apata ụkwụ aka nri anụ nke aja mfufe a na-eche nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja si bụrụ nke gị. 19Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu Onyenwe anyị ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu Onyenwe anyị nye gị na ụmụ ụmụ gị.” 20Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel. 21“Enyela m ndị Livayị, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri ahụ ụmụ Izrel niile na-akwụbatara m. Nke a bụ ihe nketa ha nʼihi ọrụ ha na-arụ nʼụlọ nzute. 22Site ugbu a gaa nʼihu, o nweghị onye Izrel ọbụla kwesiri ịbịa nso ụlọ nzute ahụ, ka ha ghara iwetara onwe ha ikpe ọmụma, mmehie na ọnwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.