Native Bible

Numbers 18:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma a gaghị agbara nwa ehi mbụ, maọbụ nwa atụrụ mbụ maọbụ nwa ewu mbụ. Ha dị nsọ. Fesa ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, ma kpọọ abụba ha ọkụ dịka onyinye e nyere site nʼọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.

Numbers 18:17 in English

Numbers 18:17 · Berean Standard Bible

But you must not redeem the firstborn of an ox, a sheep, or a goat; they are holy. You are to sprinkle their blood on the altar and burn their fat as an offering made by fire, a pleasing aroma to the LORD.

Context

15Ihe niile e bụ ụzọ mụọ, ma mmadụ ma anụ ụlọ, nke e nyere Onyenwe anyị dịka onyinye, bụ nke gị. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ, na ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ ndị na-adịghị ọcha. 16Mgbe ha dị otu ọnwa, a ga-eji shekel ọlaọcha ise, nʼusoro shekel ebe nsọ, nke bụ iri ihe ọtụtụ gera abụọ gbapụta ha. 17“Ma a gaghị agbara nwa ehi mbụ, maọbụ nwa atụrụ mbụ maọbụ nwa ewu mbụ. Ha dị nsọ. Fesa ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, ma kpọọ abụba ha ọkụ dịka onyinye e nyere site nʼọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. 18Ozu anụ ndị a niile e gburu ga-abụ nke gị, dịka obi anụ na apata ụkwụ aka nri anụ nke aja mfufe a na-eche nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja si bụrụ nke gị. 19Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu Onyenwe anyị ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu Onyenwe anyị nye gị na ụmụ ụmụ gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.