Native Bible

Numbers 17:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tinye mkpanaka ndị a niile nʼime ụlọ nzute, nʼihu Ihe Ama ahụ, ebe m na-ezute gị.

Numbers 17:4 in English

Numbers 17:4 · Berean Standard Bible

Place the staffs in the Tent of Meeting in front of the Testimony,* where I meet with you.

Context

2“Gwa ụmụ Izrel okwu, sitekwa nʼaka ha nata mkpanaka iri na abụọ otu mkpanaka nʼisi onyendu nke ebo ọbụla. Dekwasị aha onyendu ọbụla nʼahụ mkpanaka nke ya. 3Ma nʼelu mkpanaka Livayị dekwasị aha Erọn. A ga-enwe otu mkpanaka maka onyendu ebo ọbụla. 4Tinye mkpanaka ndị a niile nʼime ụlọ nzute, nʼihu Ihe Ama ahụ, ebe m na-ezute gị. 5Mkpanaka nke onye ahụ m họpụtara ga-ama ifuru ndụ. M ga-ewezugakwa ntamu niile nke ndị Izrel site nʼebe m nọ, bụ nke ha na-atamu megide unu.” 6Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu ndị a. Ndị ndu ha nyere ya mkpanaka iri na abụọ, otu mkpanaka nʼisi otu onyeisi maka onyeisi ebo ha nʼotu nʼotu. Mkpanaka Erọn dịkwa nʼetiti nke ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.