Native Bible

Numbers 16:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.

Numbers 16:40 in English

Numbers 16:40 · Berean Standard Bible

just as the LORD commanded him through Moses. This was to be a reminder to the Israelites that no outsider who is not a descendant of Aaron should approach to offer incense before the LORD, lest he become like Korah and his followers.

Context

38Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.” 39Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja, 40dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha. 41Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.” 42Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.