Native Bible

Numbers 16:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.

Numbers 16:28 in English

Numbers 16:28 · Berean Standard Bible

Then Moses said, “This is how you will know that the LORD has sent me to do all these things, for it was not my own doing:

Context

26Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.” 27Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile. 28Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m. 29Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m. 30Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.