Native Bible

Numbers 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’ ”

Numbers 15:16 in English

Numbers 15:16 · Berean Standard Bible

The same law and the same ordinance will apply both to you and to the foreigner residing with you.”

Context

14Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya. 15Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu Onyenwe anyị. 16Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’ ” 17Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 18“Gwa ndị Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-akpọbata unu nʼime ya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.