Ọnụọgụgụ 14:37
Numbers 14:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị.
Numbers 14:37 in English
Numbers 14:37 · Berean Standard Bible
those men who had brought out the bad report about the land—were struck down by a plague before the LORD.
Context
35Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ” 36Ya mere ndị ahụ Mosis zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ Izrel tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara. 37Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị. 38Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune fọdụrụ ndụ. 39Mgbe Mosis gwara ụmụ Izrel okwu niile si nʼọnụ Onyenwe anyị, ha ruru ụjụ dị ilu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.