Ọnụọgụgụ 14:3
Numbers 14:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?”
Numbers 14:3 in English
Numbers 14:3 · Berean Standard Bible
Why is the LORD bringing us into this land to fall by the sword? Our wives and children will become plunder. Would it not be better for us to go back to Egypt?”
Context
1Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile. 2Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a. 3Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?” 4Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt.” 5Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.