Ọnụọgụgụ 14:24
Numbers 14:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya.
Numbers 14:24 in English
Numbers 14:24 · Berean Standard Bible
But because My servant Caleb has a different spirit and has followed Me wholeheartedly, I will bring him into the land he has entered, and his descendants will inherit it.
Context
22Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a, 23o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya. 24Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya. 25Ma ugbu a, ebe ndị Izrel na-atụ ndị Amalek na ndị Kenan bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje Osimiri Uhie ahụ ihu.” 26Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.