Ọnụọgụgụ 13:28
Numbers 13:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ.
Numbers 13:28 in English
Numbers 13:28 · Berean Standard Bible
Nevertheless, the people living in the land are strong, and the cities are large and fortified. We even saw the descendants of Anak there.
Context
26Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. 27Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. 28Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ. 29Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.” 30Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.