Native Bible

Numbers 13:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.

Numbers 13:19 in English

Numbers 13:19 · Berean Standard Bible

Is the land where they live good or bad? Are the cities where they dwell open camps or fortifications?

Context

17Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu. 18Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole. 19Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike. 20Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.) 21Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.