Ọnụọgụgụ 11:21
Numbers 11:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku isii* ndị ji ụkwụ eje ka m nọ nʼetiti ha, ma ị na-asị, ‘Aga m enye ha anụ otu ọnwa.’
Numbers 11:21 in English
Numbers 11:21 · Berean Standard Bible
But Moses replied, “Here I am among 600,000 men on foot, yet You say, ‘I will give them meat, and they will eat for a month.’
Context
19Anụ unu ga-eri abụghị naanị nke otu ụbọchị, maọbụ ụbọchị abụọ, maọbụ ụbọchị ise, maọbụ iri, ma ọ bụkwanụ iri ụbọchị abụọ! 20Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?” ’ ” 21Ma Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku isii* ndị ji ụkwụ eje ka m nọ nʼetiti ha, ma ị na-asị, ‘Aga m enye ha anụ otu ọnwa.’ 22Ọ ga-ezuru ha ma ọ bụrụ na e gbuoro ha igwe ehi na atụrụ? Ọ bụ azụ niile nke dị nʼoke osimiri ga-ezuru ha ma egbuo ha niile nye ha?” 23Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Aka Onyenwe anyị ọ dị mkpụmkpụ? Ugbu a, ị ga-ahụ ma m ga-emezu okwu m, maọbụ na m agaghị emezu ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.