Native Bible

Numbers 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu.

Numbers 10:9 in English

Numbers 10:9 · Berean Standard Bible

When you enter into battle in your land against an adversary who attacks you, sound short blasts on the trumpets, and you will be remembered before the LORD your God and saved from your enemies.

Context

7Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche. 8“Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile. 9Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu. 10Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.” 11Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.