Ọnụọgụgụ 1:44
Numbers 1:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya.
Numbers 1:44 in English
Numbers 1:44 · Berean Standard Bible
These were the men numbered by Moses and Aaron, with the assistance of the twelve leaders of Israel, each one representing his family.
Context
42Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 43Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400). 44Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya. 45Ndị Izrel niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị nwere ike ije agha ka a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. 46Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise (603,550).
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.