Nehemaya 9:37
Nehemiah 9:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi mmehie anyị, mkpụrụ ọma niile a na-esi na ya wepụta ka ndị eze ahụ niile i mere ka ha na-achị anyị na-ewere. Ha nwere ike nʼahụ anyị, na nʼebe anụ ụlọ anyị dị ka o si dị ha mma. Anyị na-ahụjukwa anya.
Nehemiah 9:37 in English
Nehemiah 9:37 · Berean Standard Bible
Its abundant harvest goes to the kings You have set over us because of our sins. And they rule over our bodies and our livestock as they please. We are in great distress.
Context
35Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼalaeze nke aka ha na-ekpori ndụ, nke oke ịdị mma gị nke ị mere ka o rute ha aka, nʼala ọma ahụ sara mbara nwere ume i nyere ha, ha efeghị gị ofufe, ha esitekwaghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 36“Ma lee, anyị bụ ndị ohu taa, e, anyị bụ ndị ohu nʼala ahụ i nyere nna nna anyị ha, ka ọ bụrụ ebe ha ga-esi rie mkpụrụ ọ mịpụtara na ihe ọma ọ na-amịpụta. 37Nʼihi mmehie anyị, mkpụrụ ọma niile a na-esi na ya wepụta ka ndị eze ahụ niile i mere ka ha na-achị anyị na-ewere. Ha nwere ike nʼahụ anyị, na nʼebe anụ ụlọ anyị dị ka o si dị ha mma. Anyị na-ahụjukwa anya. 38“Nʼihi ihe ndị a niile, anyị na-ekwe gị nkwa ugbu a na anyị ga-efe gị. Anyị, ndịisi anyị, ndị Livayị na ndị nchụaja, na-etinye aha anyị nʼọgbụgba ndụ a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.