Native Bible

Nehemiah 9:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ị dọrọ ha aka na ntị sị ha lọghachi debe ihe i nyere nʼiwu. Ma ha sitere na nganga juru ha obi jụ idebe iwu gị. Ha mehiere megide ihe niile i nyere nʼiwu, ọ bụ ezie na ha maara na idebe ya ga-ewetara ha ndụ. Ma site nʼisiike ha, ha gbakụtara gị azụ, bụrụ ndị isiike na ndị jụrụ ige ntị.

Nehemiah 9:29 in English

Nehemiah 9:29 · Berean Standard Bible

You admonished them to turn back to Your law, but they were arrogant and disobeyed Your commandments. They sinned against Your ordinances, by which a man will live if he practices them. They stubbornly shrugged their shoulders; they stiffened their necks and would not obey.

Context

27Nʼihi nke a, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha, ndị kpagburu ha. Ma nʼime mkpagbu ha, ha kpọkuru gị, ị nọkwa nʼeluigwe nụ ekpere ha, sitekwa nʼobi ebere gị zigara ha ndị bịara zọpụta ha, na ndị napụtara ha site nʼaka ndị iro ha. 28“Ma mgbe ihe bidoro ịgara ha nke ọma, ha mekwara ihe jọrọ njọ nʼihu gị. Ọzọkwa, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha ka ndị iro ha merie ha. Ma mgbe ọbụla ndị gị chegharịkwutere gị, kpọkuo gị ka i nyere ha aka, ị na-anụ arịrịọ ha, sitekwa nʼobi ebere gị gbapụta ha. 29“Ị dọrọ ha aka na ntị sị ha lọghachi debe ihe i nyere nʼiwu. Ma ha sitere na nganga juru ha obi jụ idebe iwu gị. Ha mehiere megide ihe niile i nyere nʼiwu, ọ bụ ezie na ha maara na idebe ya ga-ewetara ha ndụ. Ma site nʼisiike ha, ha gbakụtara gị azụ, bụrụ ndị isiike na ndị jụrụ ige ntị. 30Ma i sitere na ntachiobi gị nye ha ogologo oge ichegharị; ị dọrọ ha aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị. Ya mere, i kwenyekwara ka ndị iro ha merie ha ọzọ. 31Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.