Native Bible

Nehemiah 9:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ha nupuru isi nʼokwu gị, jụ iwu gị, gbuo ndị amụma tụrụ ha mmehie ha nʼihu, meekwa ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche.

Nehemiah 9:26 in English

Nehemiah 9:26 · Berean Standard Bible

But they were disobedient and rebelled against You; they flung Your law behind their backs. They killed Your prophets, who had admonished them to return to You. They committed terrible blasphemies.

Context

24Ụmụ ha banyere nweta ala ahụ. I meriri ndị Kenan nʼihu ha, bụ ndị bi nʼala ahụ. I weere ndị Kenan ahụ nyefee nʼaka ha, ha na ndị eze ha, na ndị niile bi nʼala ahụ ka ndị gị jiri ha mee ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. 25Ndị gị nwetara ala mara mma, na ọtụtụ obodo e wusiri ike; ha nwetakwara ọtụtụ ụlọ nke ihe ọma juru nʼime ha, na olulu mmiri e gwuru nke ọma, na ubi vaịnị mkpụrụ dị, na ubi oliv, na ọtụtụ osisi ọma ndị ọzọ na-amị mkpụrụ. Ha rijuru afọ, ahụ ha mara mma ile anya, ha ṅụrikwara ọṅụ nʼihi ngọzị ị gọziri ha. 26“Ma ha nupuru isi nʼokwu gị, jụ iwu gị, gbuo ndị amụma tụrụ ha mmehie ha nʼihu, meekwa ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche. 27Nʼihi nke a, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha, ndị kpagburu ha. Ma nʼime mkpagbu ha, ha kpọkuru gị, ị nọkwa nʼeluigwe nụ ekpere ha, sitekwa nʼobi ebere gị zigara ha ndị bịara zọpụta ha, na ndị napụtara ha site nʼaka ndị iro ha. 28“Ma mgbe ihe bidoro ịgara ha nke ọma, ha mekwara ihe jọrọ njọ nʼihu gị. Ọzọkwa, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha ka ndị iro ha merie ha. Ma mgbe ọbụla ndị gị chegharịkwutere gị, kpọkuo gị ka i nyere ha aka, ị na-anụ arịrịọ ha, sitekwa nʼobi ebere gị gbapụta ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.