Native Bible

Nehemiah 8:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a.

Nehemiah 8:17 in English

Nehemiah 8:17 · Berean Standard Bible

The whole assembly who had returned from exile made booths and lived in them. From the days of Joshua * son of Nun until that day, the Israelites had not celebrated like this. And there was great rejoicing.

Context

15O kwukwara na ha ga-ekwusa okwu a nʼobodo niile nke Juda na Jerusalem sị; “Gaanụ nʼala ugwu ugwu gbute alaka osisi oliv ụlọ, na alaka oliv ọhịa, na alaka osisi mietul,* na alaka nkwụ, na alaka osisi ndị ọzọ na-enye ndo nke a ga-eji wuo ebe unu ga-ebi tutu ruo mgbe mmemme ahụ ga-agwụsị, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu.” 16Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem. 17Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a. 18Ezra na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu Chineke kwa ụbọchị, site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị ikpeazụ. Ha mere mmemme ahụ ụbọchị asaa ma nʼụbọchị nke asatọ ha nwere ọgbakọ ofufe mmechi dịka e dere ya nʼiwu. 8:15 Mietul bụ ahịhịa na-esi isi ụtọ. Aịz 41:19; 55:13

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.