Native Bible

Nehemiah 8:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.”

Nehemiah 8:11 in English

Nehemiah 8:11 · Berean Standard Bible

And the Levites calmed all the people, saying, “Be still, since today is holy. Do not grieve.”

Context

9Mgbe ahụ, Nehemaya, onyeisi ọchịchị, na Ezra, ode akwụkwọ na onye nchụaja, na ndị Livayị ahụ na-atụziri ndị mmadụ ihe, gwara ndị ahụ niile sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị, Chineke unu. Unu erula ụjụ maọbụ bee akwa.” Nʼihi na ha niile na-akwa akwa mgbe ha na-ege ntị nʼokwu niile nke iwu ahụ. 10Nehemaya gwakwara ha sị; “Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike unu.” 11Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.” 12Ya mere, ha niile lawara ị ga rie ma ṅụọ, na ikenye ndị ọzọ site nʼihe ha nwere. Ha gakwara ime mmemme nke oke ọṅụ, nʼihi na ha ghọtara okwu agwara ha. 13Nʼụbọchị nke abụọ nke ọnwa ahụ, ndịisi ezinaụlọ niile na ndị nchụaja, na ndị Livayị, zukọrọ nʼebe Ezra, bụ onye nkuzi nọ, maka itinye uche nʼakwụkwọ iwu ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.