Native Bible

Nehemiah 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”

Nehemiah 7:3 in English

Nehemiah 7:3 · Berean Standard Bible

And I told them, “Do not open the gates of Jerusalem until the sun is hot. While the guards are on duty, keep the doors shut and securely fastened. And appoint the residents of Jerusalem as guards, some at their posts and some at their own homes.”

Context

1Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị. 2Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ. 3Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.” 4Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị. 5Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya:

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.