Native Bible

Nehemiah 6:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m. 6:11 Ọ bụ naanị ndị nchụaja ka ọ dịrị ịbanye nʼEbe kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọnụ 18:22

Nehemiah 6:19 in English

Nehemiah 6:19 · Berean Standard Bible

Moreover, these nobles kept reporting to me Tobiah’s good deeds, and they relayed my words to him. And Tobiah sent letters to intimidate me.

Context

17Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka. 18Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya. 19Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m. 6:11 Ọ bụ naanị ndị nchụaja ka ọ dịrị ịbanye nʼEbe kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọnụ 18:22

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.