Native Bible

Nehemiah 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ.

Nehemiah 4:8 in English

Nehemiah 4:8 · Berean Standard Bible

and all of them conspired to come and fight against Jerusalem and create a hindrance.

Context

6Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ. 7Ma mgbe Sanbalat, Tobaya, ndị Arab, ndị Amọn na ndị Ashdọd nụrụ na ọrụ iwuzi mgbidi Jerusalem na-aga nʼihu, nụkwa na-emechichala ebe niile puru epu, iwe were ha nke ukwuu. 8Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ. 9Ma anyị kpere ekpere nye Chineke, kwụbakwa ndị nche iguzogide ha ehihie na abalị. 10Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.