Nehemaya 3:29
Nehemiah 3:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota.
Nehemiah 3:29 in English
Nehemiah 3:29 · Berean Standard Bible
Next to them, Zadok son of Immer made repairs opposite his house, and next to him, Shemaiah son of Shecaniah, the guard of the East Gate, made repairs.
Context
27Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso. 28Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya. 29Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota. 30Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya. 31Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.