Nehemaya 3:19
Nehemiah 3:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya.
Nehemiah 3:19 in English
Nehemiah 3:19 · Berean Standard Bible
And next to him, Ezer son of Jeshua, ruler of Mizpah, repaired another section opposite the Ascent to the Armory, near the angle in the wall.
Context
17Ndị na-eso ya bụ ndị Livayị, ndị nke Rehum nwa Bani na-achịkọta. Onye ọzọ bụ Hashabaya onyeisi ọchịchị ọkara ndị bi na Keila. Ọ rụrụ ọrụ e kenyere ndị ya. 18Onye ọzọ na-eso ya bụ Binui nwa Henadad onye bụ onyeisi ọchịchị ọkara akụkụ Keila nke ọzọ. O du ndị Keila ibe ya rụọ ọrụ ha ketara. 19Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya. 20Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja. 21Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.