Nehemaya 2:7
Nehemiah 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda.
Nehemiah 2:7 in English
Nehemiah 2:7 · Berean Standard Bible
I also said to him, “If it pleases the king, may letters be given to me for the governors west of the Euphrates,* so that they will grant me safe passage until I reach Judah.
Context
5ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.” 6Eze sịrị m, ebe nwunye ya nọkwa nʼakụkụ ya, “Ije gị ọ ga-abụ ruo olee mgbe, olee mgbe ị ga-alọghachitekwa?” Ọ masịrị eze i ziga m. Ya mere, enyere m ya oge. 7Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda. 8Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m. 9Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.