Native Bible

Nehemiah 2:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?”

Nehemiah 2:19 in English

Nehemiah 2:19 · Berean Standard Bible

But when Sanballat the Horonite, Tobiah the Ammonite official, and Geshem the Arab heard about this, they mocked us and ridiculed us, saying, “What is this you are doing? Are you rebelling against the king?”

Context

17Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.” 18Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya. Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge. 19Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?” 20Ma azara m ha sị, “Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gara anyị nke ọma. Anyị onwe anyị bụ ndị ohu ya ga-amalite iwughachi mgbidi a, ma unu onwe unu, unu enweghị oke maọbụ ọnọdụ ziri ezi maọbụ ihe ncheta ọbụla nʼime Jerusalem.” 2:10 Bụ onyeisi ọchịchị na Sameria. 2:13 Ọnụ ụzọ ama a dị nʼọdịda anyanwụ nke mgbidi Jerusalem, 2Ih 26:9; Neh 3:13. 2:13 Agwọ, nʼokwu ịma atụ 2:13 Ọnụ ụzọ ama dị nʼebe a na-ekpofu ahịhịa, bụ ọnụ ụzọ ndị Juu na-esite mgbe ha na-edupụ ụmụ anụmanụ e ji achụ aja, ị duru ha jeruo Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Gụọ akwụkwọ Neh 3:14; 2Ez 23:10

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.