Nehemaya 13:7
Nehemiah 13:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya.
Nehemiah 13:7 in English
Nehemiah 13:7 · Berean Standard Bible
to return to Jerusalem. Then I discovered the evil that Eliashib had done on behalf of Tobiah by providing him a room in the courts of the house of God.
Context
5o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a. 6Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn,* a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike 7laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya. 8Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi. 9Enyere m iwu ka e doo ọnụụlọ ndị ahụ niile ọcha, a chighachikwara m ngwongwo ụlọ Chineke niile nʼime ha, ha na onyinye mkpụrụ ọka, na ụda na-esi isi ụtọ ndị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.