Nehemaya 13:2
Nehemiah 13:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)
Nehemiah 13:2 in English
Nehemiah 13:2 · Berean Standard Bible
because they had not met the Israelites with food and water, but had hired Balaam to call down a curse against them (although our God had turned the curse into a blessing).
Context
1Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke. 2Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.) 3Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha. 4Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.