Nehemaya 12:42
Nehemiah 12:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọzọ sokwa bata bụ ndị a: Maaseia, Shemaya, Elieza, Uzi, Jehohanan, Malkija, Elam na Eza. Onyendu ndị ọbụ abụ ahụ niile bụ Jezrahaya.
Nehemiah 12:42 in English
Nehemiah 12:42 · Berean Standard Bible
and also Maaseiah, Shemaiah, Eleazar, Uzzi, Jehohanan, Malchijah, Elam, and Ezer. Then the choirs sang out under the direction of Jezrahiah.
Context
40Ya mere, ụzọ ndị mmadụ abụọ na-abụ abụ ekele nye Chineke zukọtara bata nʼụlọnsọ ukwu. Esokwa m ha bata, mụ na ọkara ndị ndu, 41tinyere ndị nchụaja ndị a: Eliakịm, Maaseia, Miniamin, Mikaya, Elioenai, Zekaraya na Hananaya. Ndị a niile ji opi ha. 42Ndị ọzọ sokwa bata bụ ndị a: Maaseia, Shemaya, Elieza, Uzi, Jehohanan, Malkija, Elam na Eza. Onyendu ndị ọbụ abụ ahụ niile bụ Jezrahaya. 43Ha chụrụ ọtụtụ aja nʼụbọchị ahụ nʼihi na Chineke nyere ha oke ọṅụ. Ụmụnta na ndị inyom sokwa ṅụrịa ọṅụ. Ha nụkwara ụda ọṅụ ndị Jerusalem site nʼebe dị anya. 44Nʼoge ahụ ka a họpụtara ndị ikom na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe, ebe a na-achịkọba onyinye mkpụrụ mbụ, na onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri. A na-esite nʼobodo gbara Jerusalem gburugburu na-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe onyinye niile e nyere nʼiwu maka ọdịmma ndị nchụaja na ndị Livayị. E si otu a na-ewebata ya nʼihi na ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị na-arụ na-atọ ndị Juda ụtọ nke ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.