Nehemaya 11:22
Nehemiah 11:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-elekọta ndị Livayị bi na Jerusalem bụ Uzi, nwa Bani, nwa Hashabaya, nwa Matanaya, nwa Matanaia, nwa Mika. Uzi bụ otu onye si nʼikwu Asaf, ndị ọbụ abụ maka ije ozi nke ụlọ Chineke.
Nehemiah 11:22 in English
Nehemiah 11:22 · Berean Standard Bible
Now the overseer of the Levites in Jerusalem was Uzzi son of Bani, the son of Hashabiah, the son of Mattaniah, the son of Mica.* He was one of Asaph’s descendants, who were the singers in charge of the service of the house of God.
Context
20Ndị fọdụrụ nʼIzrel, ha na ndị nchụaja, na ndị Livayị, nọ nʼobodo Juda niile, onye ọbụla nʼihe nketa ya. 21Ndị ahụ niile na-eje ozi nʼụlọnsọ bi nʼugwu Ofel. Ndịisi ha bụ Ziha na Gishpa. 22Onye na-elekọta ndị Livayị bi na Jerusalem bụ Uzi, nwa Bani, nwa Hashabaya, nwa Matanaya, nwa Matanaia, nwa Mika. Uzi bụ otu onye si nʼikwu Asaf, ndị ọbụ abụ maka ije ozi nke ụlọ Chineke. 23Eze họpụtara ndị ọbụ abụ nyekwa ha ọrụ ha kwesiri ịrụ ụbọchị niile. 24Petahaya nwa Meshezabel, onye bụ otu nʼagbụrụ Zera, nwa Juda, bụ onyeozi eze banyere ihe niile gbasara ndị mmadụ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.