Nehemaya 10:39
Nehemiah 10:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Izrel na ndị Livayị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ. “Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ Chineke anyị azụ.” 10:38 Ọtụtụ ọnụụlọ nchịkọba ihe dị nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ nʼebe a ka a na-edebe ngwongwo niile dị nsọ. Gụọ ebe ndị a; 1Ih 9:26; 2Ih 31:11; Neh 13:7; Mal 3:10.
Nehemiah 10:39 in English
Nehemiah 10:39 · Berean Standard Bible
For the Israelites and the Levites are to bring the contributions of grain, new wine, and oil to the storerooms where the articles of the sanctuary are kept and where the ministering priests, the gatekeepers, and the singers stay. Thus we will not neglect the house of our God.”
Context
37“Karịsịa, anyị ga-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ Chineke anyị, nyekwa ha ndị nchụaja, ụtụ ọka mbụ anyị kwọrọ, ya na onyinye ndị ọzọ nke mkpụrụ ubi mbụ anyị, dịka mmanya vaịnị mbụ, mmanụ oliv mbụ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Anyị kpebikwara inye ndị Livayị otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile anyị nwetara nʼubi anyị, nʼihi na ọ bụ ọrụ ndị Livayị ịnakọta otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼobodo niile ebe anyị na-arụ ọrụ. 38Ndị nchụaja bụ ụmụ ụmụ Erọn ga-eso ndị Livayị mgbe ha na-anakọta onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ndị a. Ha ga-ewekọta ihe ndị a niile webaa ha nʼụlọ Chineke anyị, ruo nʼime ọnụụlọ ịchịkọba ihe,* nke ụlọakụ. 39Ndị Izrel na ndị Livayị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ.
“Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ Chineke anyị azụ.”
10:38 Ọtụtụ ọnụụlọ nchịkọba ihe dị nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ nʼebe a ka a na-edebe ngwongwo niile dị nsọ. Gụọ ebe ndị a; 1Ih 9:26; 2Ih 31:11; Neh 13:7; Mal 3:10.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.