Mak 9:22
Mark 9:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.”
Mark 9:22 in English
Mark 9:22 · Berean Standard Bible
“It often throws him into the fire or into the water, trying to kill him. But if You can do anything, have compassion on us and help us.”
Context
20Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya. 21Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, “Olee mgbe ihe a bidoro?”
Ọ zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata nta. 22Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.” 23Jisọs sịrị ya, “ ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ.” 24Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.