Mak 7:32
Mark 7:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka.
Mark 7:32 in English
Mark 7:32 · Berean Standard Bible
Some people brought to Him a man who was deaf and hardly able to speak, and they begged Jesus to place His hand on him.
Context
30Ọ laghachiri nʼụlọ ya, hụ nwantakịrị ahụ ka o dina nʼelu ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụọkwala. 31Emesịa, ọ hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs. 32Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka. 33O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire. 34O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.